Ezekiel 29

Amụma megide Ijipt

Ikpe ọmụma dịrị Fero

1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

“ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt,
gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi.
Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl,
ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
4Ma aga m etinye nko nʼagba gị,
mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile,
mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
5Aga m ahapụ gị
na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,
ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,
a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,
nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri
nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
6Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

“ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
7Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.

8“ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị. 9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
10Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
Ya bụ, mgbago Naịl
11Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị. 12Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.

13“ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara. 14Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ. 15Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ. 16Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ
Maọbụ, Onyenwe ha
Onyenwe anyị.’ ”

Ụgwọ ọrụ Nebukadneza

17Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa. 19Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya. 20Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”

21“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi
Mpi Nʼebe a na-egosipụta ịdị ike
puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Copyright information for IboBIU